Researchers on ICTs in Education (RICTHE), Africa (2021) Usoro mmadụ ga-eso tụọ atụmatụ ndụ ya: Nkeji nke mbụ, ọmụmụihe nke mbụ. [Teaching/Learning Resource]
Life Plan 1 (Igbo) print.pdf - Supplemental Material
Available under License Creative Commons Attribution.
Language: Igbo
Download (846kB)
Life plan 1 Igbo audio.mp3 - Supplemental Material
Language: Igbo
Download (7MB)
Ọtụtụ ndị Nigeria gụchaa akwụkwọ, ha anaghị ama ihe ha ga-eme na-akpata ego, na-ebi ezi ndụ ga-enye ha afọ-ojuju, nakwa na-enye aka na mmepe obodo. Mgbagwojuanya na ahụhụ na-esi n’ọnọdụ a apụta emeela ọtụtụ mmadụ akwụọ ụdọ ma ọ bụ nwee akụkọ ọzọ na-agba anyammiri. Ihe na-ebute ọnọdụ a bụ na ndị mmadụ anaghị atụ atụmatụ maka ndụ ha nihi na ha amaghị ka e si-eme ya. Ọ̀mụ̀mụ̀ihe a na ndị ọzọ gbakwụnyere na ya na-enye nnukwu aka ịmụta ka e si-atụ atụmatụ ndụ, ka onye ọbụla chee ihu n’ime ihe na-enye afọ-ojuju, ma zeere ihe na-akpata igbu oge, nmefu akụ na ụba na ọnọdụ ịta ikikere eze nihi amaghị ihe a ga-eme. A kọwara nzọụkwụ abụọ dị mkpà a na-ebu ụzọ azọ̀ n’ịtụ atụmatụ ndụ. Na ngwụcha nkọwa nzọụkwụ, onye na-amụ ihe ga-eme ihe omume ga-enyere ya aka inwe ezigbo nghọta na ịzọ nzọụkwụ ahụ.
Item Type: | Teaching/Learning Resource |
---|---|
Language: | Igbo |
Learning outcomes: | 1. Onye sonyere n’ọ̀mụ̀mụ̀ihe a ga-enwe atụmatụ maka ndụ ya, na-agbaso ihe ndị dị mkpa imejupụta atụmatụ ya ịbụ onye ọ chọrọ ịbụ, ma bụrụ onye ahụ ọ chọrọ ịbụ. 2. Ọ̀mụ̀mụ̀ihe a ga-emekwa ka onye ahụ bụrụ onye ma ka e si-ahazi ọtụtụ ihe n’usoro idebe nke kacha mkpa n’ihu ma debe nke ọ ka mkpa n’azụ ya. |
Search terms: | atụmatụ ndụ | ebumnuche | ọdịnihu, ịhazi ihe | soshal stọdị | ọmụmụihe |
Subjects: | Social Sciences General |
Level: | Subject Resources > Junior secondary/Secondary/Senior Phase (e.g.Years 7-9) Subject Resources > Upper primary/Primary/Intermediate Phase(e.g. Years 4-6) |
Class: | Class 4 |
Related URLs: | |
Program: | Powerful Information for Education, Culture, Health, Agriculture, Rural Technology & Socio-economic development (PIECHARTS) |
Depositing User: | COL Staff |
Date Deposited: | 30 May 2021 15:14 |
Last Modified: | 30 May 2021 15:14 |
URI: | https://oer4nosp.col.org/id/eprint/212 |